NTUCHA OZI ORIAKỤ OBIANỌ ZIRI ỤMỤAKA N’ỤBỌCHỊ NCHETA ỤMỤAKA NKE AFỌ 2018
Keywords:
Oriakụ Obianọ, ụmụaka nke afọ 2018, ederedeAbstract
Nchọcha a bụ maka ntucha ozi Oriakụ Obianọ ziri ụmụaka n’ụbọchị ncheta ụmụaka nke afọ 2018. Ihe kpalitere mụọ nwa nchọcha ime nchọcha n’isiokwu a bụ na e nwekebeghị ihe ederede n’emereme nsinokwu n’asụsụ Igbo dị ka e nwere n’asụsụ Bekee. Ihe nwa nchọcha bu n’obi bụ ịchọpụta ma agwa atọ dị n’emereme nsinokwu ha apụtara ihe n’ozi Oriakụ Obianọ ziri ụmụaka tinyere ịma ma o nwere ka emereme nsinokwu si ebulite mmekọ mmadụ na ibe ya. A gbasoro atụtụ emereme nsinokwu nke Austin (1962) na Searle (1969) na atụtụ ndịmkpa nke Sperber na Wilson (1986) mee nchọcha a. Ụfọdụ nchọpụta e nwetara na nchọcha a bụ na agwa atọ dị n’emereme nsinokwu n’ọrụ asụsụ niile pụtachara ihe n’usoro izi ozi ahụ dị ka iji mejupụta mbunuche onye na-ezi ozi. Nchọpụta ọzọ bụ na ọnọdụ adịmire atọ pụtakwara ihe na nchọcha a. Ọzọ bụ na e nwere arịrịọ, ndụmọdụ, ekele na ikwe nkwa n’ozi a nke dị n’emereme nsinokwu. Uru nchọcha a bụ na ọ ga-enye aka igbochi nsogbu a na-enwe na nghọtahie na nkwuhie echiche na-adị n’okwu mgbe a na-ezi ozi n’ebe ndị Igbo nọ. Uru ọzọ bụ na nchọcha a ga-enye aka tinyekwue n’ọnụọgụ ihe e derela n’isi okwu a ma nyekwa aka ibelata nsogbu na ọgbaaghara na-adapụta n’etiti ndị mmadụ, ma n’etiti obodo na obodo maka ndomanya ọ na-ewebata. Uru ọzọ bụ na okwuu na-eji nkọwaru emereme nsinokwu ewulite mmụọ ọnụụ n’ime ka o gee ntị ma ghọta ihe a chọrọ ka ọ ghọta nke na-eweta ezi mmekọrịta n’etiti okwuu na ọnụụ. Aro omenala Igbo ga-akaba ahụ mee ka e nwee ihe odide n’ebe ọ dị ukwuu gbasara emereme nsinokwu n’asụsụ Igbo dị ka ọ dị n’asụsụ Bekee.