NTỌSASỊ NDEHIE ỤTỌASỤSỤ EDEREDE MGBASAOZI IGBO NDỊ A HỌRỌ

Authors

  • Egwuonwu-Chimezie, Gloria Nkiru (Ph.D); Medolu, Agatha Obiageli (Ph.D) Author

Keywords:

ntọsasị ndehie, Igbo, iwu odide asụsụ

Abstract

Nchọcha a lebara anya n’isiokwu bụ ntọsasị  ndehie dị  n’ederede mgbasaozi Igbo ise. Ndehie bụ ị dachapụ n’usoro iwu odide asụsụ. Ọtụtụ ọge ka ụfọdụ ndị  odee mgbasaozi Igbo na-ede n’agbasoghị iwu na-achị   asụsụ Igbo. Ụfọdụ ndị  na-ede ederede mgbasaozi Igbo n’ụlọọrụ dị  iche iche anaghị agbaso iwu ụtọasụsụ Igbo. Ha na-ede dị ka o si masị  ha. Ha anaghị  akpachapụ anya oge ha na-ede asụsụ Igbo. Ndị  isi ụlọọrụ ndị  a anaghị  achọ ndị  gụrụ asụsụ Igbo mgbe ha chọrọ ide mgbasaozi ụlọọrụ ha n’Igbo. Ọ dị  ka aga-asị  na ha na-eche na onye ọbụla ma asụ Igbo ma ede ya. Ndehie na adị  n’ime ederede mgbasaozi ụfọdụ na-ebutere ndị  na-agụ ya nghọtahie nakwa enweghị  nghota ihe e dere ma ncha. Ebe e siri nweta ngwa nchọcha bụ n’ihe odide mgbasaozi Igbo ise. A tụchasị rị  ederede mgbasaozi ndị  a nke ọma ma chọpụtacha iwu ụtọasụsụ Igbo dị  icheiche nke odee agbasoghị . Onye nchọcha ji ọgụgụ isi ya dị ka onye gụrụ maka asụsụ Igbo wee tụchaa akwụkwọ mgbasozi a. A chọpụtara na ụdị  ndehie na-apụtakarị cha ihie n’akwụkwọ mgbasaozi bụ e deteghị  nnyemakangwaa, agbasoghị iwu na-achị  odide mbuụzọ, etinyeghị  ntụpọ ebe o kwesị rị , asụpeghị  mkpụrụedemede ndị  gbara mkpị nke ọma, e deteghị  nnọchiaha na nrụaka nke ọma na ngwakọta asụsụ Bekee na asụsụ Igbo. A na-atụ aro ka onye ọbụla chọrọ ibipụta ederede mgbasaozi asụsụ Igbo hie asaa n’anya ma nye ya ndị  gụrụ maka asụsụ Igbo ka ha dee.

Downloads

Published

2026-09-20