MKPA Ọ DỊ IZULITE ỤMỤAKA N’ỊSỤ ASỤSỤ IGBO

Authors

  • Christian E. C. Ogwudile Author

Keywords:

Igbo, Asụsụ Igbo, ụlọ akwụkwọ

Abstract

Ihe nụrụ  ọchọcha  ọkụ n’obi ịbagide na nchọcha a bụ na sọ ndị okenye ka a na-ahụzị n’ọtụtụ obodo n’ala Igbo taa na-asụ asụsụ Igbo.  Ọtụtụ ụmụaka Igbo amaghị ka e si asụ ma ya fọdụzịa ide asụsụ Igbo. Ihe kpatara nke a bụ n’ihi na nne na nna ndị ụmụaka ndị a nọ n’okpuru ha anaghị ekwe ka ụmụaka mụta ma ọ bụ sụọ Igbo.   Ụdị agwa  ọjọọ a juru ma n’obodo mepere emepe ma nke emepeghị emepe. Nkọwa a zipụtara na nwa  ọ bụla a mụrụ zuru oke nwere ngwa dị ya n’ụbụrụ nke  ọ ga-eji amụta asụsụ. N’ihi nke a, ọ dị oke mkpa isite na nwata dubanye nwata n’asụsụ ebe a mụnyere ya. Nke a ga-enyere ya aka ịmụta asụsụ ọ bụla e buru ụzọ rupunye n’ime ya.  Ọ ga-enyekwara ya aka ka  ọ mụta ihe ndị  ọzọ o kwesiri ịmụta mgbe ọ na-eto. A gbasoro usoro sọvee wee mee nchọcha a. Nchọpụta gosiri na  ọ bụrụ na ụdị  ọnọdụ a adịrị gawa, a gaghị enwe mmasị n’asụ ma ya fọdụ ide asụsụ Igbo n’ihi na mgbe ndị okenye na-asụ Igbo nwụchaara, asụsụ Igbo ga-esokwara nwụọ pịị; mgbe ahụ ihe a na-afụ apịaa. Alo  ọchọcha wee bụrụ na ndị Igbo pụrụ ịgbanahụ  ọnwụ asụsụ ha ma  ọ bụrụ na e bido na nwata mee ka ụmụaka Igbo nwee mmasị ịsụ, ịgụ na ide asụsụ Igbo. Ha ga na-eme nke a ma n’ezinaụlọ, n’ụlọ akwụkwọ, ụlọ ụka, ụlọ  ọrụ, ụlọ ahịa na ebe niile ha nwetara onwe ha. Ime nke a ga-enyere aka ime ka asụsụ Igbo digide ghara ịnwụ.

Downloads

Published

2026-09-20