ABỤ EDEREDE DỊKA ENYO E JI AHỤTA OMENAALA NA NKWENYE NDỊ IGBO: ITULE ABỤ ỤFỌDỤ DỊ N’Ọ NATARA CHI

Authors

  • Prof. Ogochukwu Roseline Ifeka; Chioma Oluchi Ohanwe Author

Keywords:

Abụ, Abụ edereede, Igbo

Abstract

Abụ edereede Igbo bụ otu n’ime ụzọ kacha mkpa ndị Igbo si ewebata echiche, ụzọ obibi ndụ, ma na echekwaba omenaala na nkwenye ha. N’agbanyeghị nke a, ọ dị mkpa na e mere nnyocha iji kọwaa n’ụzọ zuru oke, etu abụ edereede si bụrụ enyo e ji ahụta omenaala na nkwenye ndị Igbo. Nke a kpaliri mmụọ ndị nchọcha ileba anya n’akwụwkọ abụ Ọ Natara Chi, nke Ifeka Ọgọchukwu dere, iji gosi ka odeabụ si zipụta omenaala na nkwenye ndị Igbo n’abụ ya. Abụ dị n’akwụkwọ abụ a dị iri atọ na abụọ, mana ebumnoobi ndị nchọcha bụ ileba anya naanị n’abụ anọ ndị a bụ; N’Agbụrụ Nna M Ha, Ije Di, Ofufe na Ori Ekpe, nyochaa ha ma zipụta ihe ndị mebere omenaala na nkwenye ndị Igbo n’abụ ndị ahụ n’otu n’otu. Atụtụ e ji mee nchọcha a bụ Atụtụ Kọlchọral Matịrịalizim, nke bụ usoro echiche e ji enyocha ederede omenaala na nkwenye agbụrụ. A chọpụtara na abụ anọ e jiri mee nchọcha zipụtara omenaala na nkwenye ndị Igbo dị icheiche n’ozuzu oke dị ka; alụmdi, iriekpe, nkuchi nwaanyị, ịgba afa ịkpụ arụ, ọmụgwọ, mkpa nwa dị na ndị ọzọgasi. A tụrụ anya na nchọcha a ga-enyere ọhanaeze aka ịmata na abụ edereede Igbo na-enwe nzipụta omenaala na nkwenye ndị Igbo n’ime ha. Ndị nchọcha wee na-enyekwa ohere ka onye nwere mmasị imere nchọcha a gawa n’ihu mee nke a, ma tinyekwa ihe ndị abataghị n’ime nchọcha a na nke ya.

Downloads

Published

2026-09-19