ASỤSỤ IGBO DỊ KA NGWA AHỊA

Authors

  • Aloysius Umeodinka; Chinwude Ugochukwu Author

Keywords:

Asụsụ, Asụsụ Igbo, Ndi Igbo

Abstract

Mmadụ na-esite n’onyinye Chineke nyere ya aba ọgaranya, ma ọ bụrụ na o jiri onyinye ahụ nke ọma ma chekwaa ya. Asụsụ Igbo bụ onyinye pụrụ iche Chineke nyere ndị Igbo, dịka o siri nye ndị France asụsụ French, ndị England asụsụ English, ndị Germany asụsụ German, ndị Portugal asụsụ Portuguese na mba ndị ọzọ dị n’ụwa. Ewezuga ndị Igbo, mba ndị ọzọ jiri asụsụ ha mee ngwa ahịa nke mba dị iche iche na-azụ, nke na-enyekwara ha nnukwu ego. Nchọcha a chọrọ igosi na asụsụ Igbo zuru oke ịbụ ngwa ahịa. Ọ chọrọ ịkọwapụta etu a ga-esi kwalite asụsụ Igbo ka ọ bụrụ ngwa ahịa nke nwere ike iweta nnukwu ego, ma gosikwa ihe ndị na-egbochi ndị mmadụ iji asụsụ Igbo dịka ngwa ahịa. N’iji mee ihe ndị a, usoro nchọcha anyị ga-agbaso bụ usoro nkọwa. Atụtụ anyị ga-eji eme ya bụ Atụtụ Ngwakọta Usoro Azụmahịa, nke sitere n’aka McCarthy (1960). Nchọpụta nchọcha a na-egosi na ndị Igbo kwesịrị ịkpachara asụsụ ha anya, tinye uchu na ọganihu ya. Ha kwesịkwara ịhazi asụsụ ha nke ọma, ma na-eme ka ha na Gọọmentị Steeti na nke Etiti nwee ezigbo mmekọrịta n’iwelite ọnọdụ asụsụ Igbo n’ụdị nke ga-eme ka ọ too ma bụrụkwa ihe a na-eji emepụta akụ na ụba dịka ngwa ahịa a na-achọ n’ahịa.

Downloads

Published

2026-09-19