NSỌGBỤ OLUNDỊ NA-EBUTE N’ỊMỤỤ ASỤSỤ IGBO IZUGBE: ISIALA NGWA DỊ KA EBE MGBAKWASA ỌKWỤ

Authors

  • Chinwendu E. Oparah Author

Keywords:

Igbo, Hausa, Yoruba

Abstract

Obodo anyị bụ Naịjirịa, bụ obodo nwere agbụrụ dị iche iche karịrị narị abụọ na ise n’ọnụọgụgụ (Emenanjo, 1978). N’ime agbụrụ ndị a, Igbo, Hausa na Yoruba kacha pụta ihe. Gọọmentị ala anyị agbaala mbọ iwepụta atụmatụ, ebumnuche na iwu na-achị mmụta n’ala anyị. Otu n’ime atụmatụ ndị a bụ mkpa ọ dị ịmụ asụsụ ala anyị, nakwa mkpa ọ dị itinye asụsụ Igbo n’ihe ọmụmụ n’ụlọ akwụkwọ. Nke a ga-eme ka e nwee ezi nchekwa nke omenala na ọdịnala anyị. Ndị ọchịchị hụtara asụsụ dịka ihe ga-eweta njikọ nke mba. Asụsụ bụ ụzọ dị iche iche mmadụ na ibe ya si enwe mmekọrịta. Ọ bụkwa ụda sitere n’olu mmadụ nwere nghọta, mgbe akụkụ okwu dị iche iche na-emegharị ahụ n’ụzọ dị iche iche (Anozie, 1999). Asụsụ bụkwa usoro okwu ma ọ bụ nhazi ụda nke otu mba maara nke ọma ma jiri ya na-ekwurịta okwu n’etiti onwe ha. Mbah na Mbah (2001) kọwara asụsụ dịka ụzọ e si ezipụta ebumnuche mmadụ, mmekọrịta mmadụ ma ọ bụ ihe mmadụ chọrọ site n’ụda ma ọ bụ akara ederede. Mgbe ọ bụla anyị na-ekwu okwu n’asụsụ, ma ọ bụ nke a na-ekwu ma ọ bụ nke ederede, ọ dị mkpa ịtụgharị uche n’ihi na ọtụtụ ndị mmadụ na-eji asụsụ eme ihe n’enweghị mmasị ma na-ewere asụsụ Igbo dịka ihe a ga-eleghara anya. Ma mgbe anyị kwuwere okwu asụsụ kpọmkwem, ọkachasị mgbe a na-eji ya akụzi ihe, anyị na-ahụ ọtụtụ ihe ịma aka chere mmadụ ihu. Nke a mere Agbedo (1991) jiri kwuo na “asụsụ bụ ndụ dị n’isi opi na-ebe ndụ mmadụ dị.” Nke a pụtara na asụsụ metụtara ihe niile mmadụ na-eme na ndụ. Agbedo (1991) gara n’ihu kọwaa na ọdịnala ndị mmadụ ji biri kwesịrị inwe asụsụ, nke a pụtara na omenala enweghị ike ịrụ ọrụ nke ọma ma ọ bụrụ na asụsụ akwadoghị ya. A hụrụ asụsụ dịka onyinye Chineke nyere mmadụ, nke mmadụ ọ bụla e kere eke nwere ike iji wee kparịta ụka ma ọ bụ kọwapụta ihe bụ mkpa ya. N’akwụkwọ Stonehill na ndị ọzọ (1979), a kọwara na Chineke jiri ọtụtụ asụsụ tinye nsogbu n’etiti ndị Babilọn mgbe ha na-arụ ụlọ elu ha chọrọ iru n’eluigwe. N’ihi nke a, agbụrụ ndị ahụ gbasara, nke wetara ọtụtụ asụsụ dị iche iche n’elu ụwa taa.

Downloads

Published

2026-09-19