ỊGBÀ MMANWỤ, OTU N’IME OMENALA IGBO: UGWÙ NA NSỌPỤRỤ, ỌDỊDA NA OLILEANYA YA
Keywords:
Igbo, Ndị Igbo, NaịjirịaAbstract
Ndị Igbo bụ otu n’ime agbụrụ atọ kacha buru ibu n’ala Naịjirịa. E nweela ọtụtụ akụkọ gbasara otu ndị Igbo si malite, mana e nwebeghị ezigbo nkwekọrịta banyere akụkọ mmalite ndị a. Site n’ihe ndị a chọpụtara n’Igbo-Ukwu, bụ ebe e nwere ihe ndị gosiri njirimara ndị Igbo, a chọpụtara na ndị Igbo anọwo ihe dịka puku afọ ise gara aga. Ha bụ ndị maara onwe ha, ndị na-agba mbọ na ndị gbasiri ike. A na-ahụ ha na mba dị iche iche, ha na-asụkwa otu ụdị asụsụ. Otu ihe jikọtara ha ọnụ bụ omenala ha. Anozie (2003:106) kọwara omenala dịka “ụzọ dị iche iche ndị mmadụ si ebi ndụ, emume ha, ihe ha na-eri, iyi akwa na ikele ekele.” Agbụrụ ọ bụla nwere omenala ya pụrụ iche, nke na-adịghị anwụ n’onwe ya. Ihe gbasara obibi ndụ dị mkpa na ndụ mmadụ bụ otu n’ime ihe na-egosipụta omenala. Nke a mere mmadụ jiri dị iche n’ebe ihe ndị ọzọ Chineke kere eke dị. Omenala Igbo bụ ihe ndị e ji mara ndị Igbo na-eme, dịka ilu nwaanyị, ile ọmụgwọ, echichi dị iche iche, ịgba mmanwụ, ekike, ịgba mgba, ihe oriri ha na ndị ọzọ. Omenala na-apụtakwa ìhè n’ihe ndị a, ọchịchị, okpukperechi, akparamaagwa na ewumewu. Ịgba mmanwụ bụ otu n’ime omenala ndị a. Ekwealor (2010:29) kọwara omenala dịka “otu ndị si ebi ndụ ha. Ọ bụ omenala ndị ka e ji amata ha. Ọ bụ nke a mere na ọ dị nnukwu mkpa na ndị ọ bụla ga na-echekwa omenala ha.” Ogbalu (1981), n’ime Ekwealor (2010:29), kọwara omenala dịka “ihe anyị na-eme, otu anyị si adị ndụ, ihe anyị na-eri na ihe anyị na-etinye n’ahụ, otu anyị si eji ejiji, ihe e jiri mara anyị dịka mba, abụ anyị na-abụ, egwu anyị na-ete, omume na agwa anyị na-akpa.”