NZỊPỤTA NDỤ NDỊ IGBO SITE N’ABỤ ỌDỊNALA
Abstract
Ndị Igbo nwere ọrụ dị iche iche ha na-arụ, nke ha si na ya akpata ihe ha ji ele ndụ anya. Ọrụ ugbo bụ otu n’ime ọrụ kacha pụta ìhè ha na-arụ. Ha na-akụkwa ọtụtụ mkpụrụ osisi, na-akpa anụ ụlọ ma na-emepụta ihe nka dị iche iche. Ndị Igbo nwekwara ụzọ dị iche iche ha si enwe ezumike. Ọ bụ n’oge a na-ezu ike n’ọrụ ka e ji amụ egwu dị iche iche, dịka egwu mmanwụ, egwu ụmụntakịrị, egwu ụmụnwaanyị na nke ụmụ nwoke. Ha na-eji egwu ndị a eme ka obodo kpoo ọkụ tịmadị mgbe a na-eri oriri. Ọzọkwa, egwu ndị a na-ezipụta ụzọ ndụ, nkwenye na omenala ndị Igbo n’ụzọ dị iche iche. Abụ ọdịnala Igbo bụ ihe na-alazi azụ ma na-anwụnyụzi anya n’oge ugbu a n’ihi nleghara anya ndị Igbo na-eleghara abụ ọdịnala ha anya. Ebumnobi nchọcha a bụ igosipụta abụ ọdịnala dịka enyo e ji ahụ ndụ n’ọnọdụ dị iche iche na ndụ ndị Igbo. A lebakwara anya n’ihe bụ abụ ọdịnala na ụdị abụ ọdịnala dị iche iche, dịka abụ mmanwụ, abụ nwa, abụ agha, abụ ntọaja, dgz. A gbasoro usoro sọvee (survey research) site n’ajụjụ ọnụ a gbara ndị mmadụ, wee nweta ngwaọrụ e ji mee nchọcha a. A chọpụtakwara uru abụ ọdịnala bara, dịka inye aka n’igbazi ndụ ọha na eze. Na nchịkọta, a tụrụ anya na ụmụ amaala Igbo niile ga-esite na mpụtara nchọcha a were nye abụ ọdịnala Igbo ọnọdụ kwesịrị ekwesị na ndụ ha.