NTỤGHARỊ ISI NKE ABỤỌ: IDUUAZỤ CHIKE AND THE RIVER N’ASỤSỤ IGBO

Authors

  • Daniel Ilechukwu; Chioma Arazu Author

Abstract

Ntụgharị bụ iwere isi n’otu asụsụ degharịa ya n’asụsụ ọzọ. E nwere usoro dị iche iche e si eme ntụgharị. Usoro ndị ahụ na-enye aka ime ka ntụgharị gaa were were ma doo anya. Ha gụnyere Usoro Ntụgharị Teknụzụ (Technological Translation), Usoro Ntụgharị Mkpokọta (General Translation) na Usoro Ntụgharị Agụmagụ (Literary Translation). Mana ntụgharị metụtara ederede a bụ Ntụgharị Agụmagụ (Literary Translation). Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị emeela ntụgharị akwụkwọ agụmagụ iduuazị site n’asụsụ Bekee banye n’Igbo, ọ dịbeghị onye tụgharịrị akwụkwọ agụmagụ Chike and the River n’Igbo. Ọ bụ ya kpatara e ji họrọ ịtụgharị naanị isi nke abụọ nke akwụkwọ a n’Igbo. Iji hụ na e mere ntụgharị kwesịrị ekwesị, a gbasoro usoro dị iche iche e si eme ntụgharị, dịka Mbite (Loaning), Ntụgharịta (Calque), Mgbanwegharịa (Transposition) na Nhara (Equivalence). A gbasoro atụtụ nchọcha a kpọrọ “Dynamic Equivalence,” nke Alexandra Tytler wubere n’afọ 1790, wee jiri ya mee nchọcha a. Ntụgharị akwụkwọ a ga-eme ka ndị na-amaghị asụsụ Bekee nwee ike ịgụ ya n’Igbo ma mata echiche odee gbasara akwụkwọ ahụ na ihe ndị ọ na-akụzi. Ọ ga-akpalitekwa mmụọ ọtụtụ ndị na-eme ntụgharị agụmagụ site n’ụzọ dị otu a, ma mee ka e nwekwuo mmasị na ntụgharị akwụkwọ agụmagụ n’Igbo. N’akwụkwọ a, a chọpụtara na nwata irube isi na-ewetara ya ndụ na agamniihu, dịka a hụrụ ya na ndụ Chike. A chọpụtakwara na a naghị eme ntụgharị n’okwu n’okwu, kama a na-agbaso nghọta dị n’ihe a na-atụgharị.

Downloads

Published

2026-09-19