INAKAMMA N’EMUME OJI N’OKO

Authors

  • Nneke Charles Azubuike Author

Keywords:

Obodo Oshimiri South, Delta State, Ọjị

Abstract

Nnyocha a lebara anya n’emume ndị Oko, nke bụ obodo dị n’Ọchịchị Ime Obodo Oshimiri South na Delta State, na-emere ọjị gbara ibe isii ma ọ bụ asaa. Emume ọjị gbara ibe isii na asaa n’Oko bụ nkwenkwe na emume kwesịrị ka ọha na eze mata dị ka otu n’ime omenala ndị Igbo. Ọjị bụ mkpụrụ osisi gazuru Igbo ọnụ, mana emume a na-emere ya dị iche iche na mpaghara dị iche iche n’ala Igbo. Ọ bụ nke a mere ka ọ dị mkpa ka ọha na eze mata etu ndị Oko si eme emume ọjị gbara ibe isii ma ọ bụ asaa. N’Oko, ọ na-abụ ha nnukwu ihe ọṅụṅụ mgbe ọjị gbara ibe isii ma ọ bụ asaa pụtara n’otu oge ma ọ bụ n’amụma iche ọjị ha. Ọjị gbara ibe isii bụ nke pụtara ihe n’emume ha na-emere ya. Ha na-egosipụta ọṅụ na obi ụtọ ha, nke sitere na nkwenye ha na ọjị gbara ibe isii bụ mmalite eze ọjị. Echiche dị etu a pụtara ihe na nkwenye ha na ọjị gbara ibe isii na-egosipụta akụ nke mmadụ na akụnụba. Ọjị gbara ibe isii na-abụrụ ha ihe ọṅụṅụ, ọ bụ nke a mere na oge ọ bụla a wara ya, ha na-emere ya emume. Nkwenye dị etu a ka ha ji ekwu na ihe ma ọ bụ onye e ji maka ya chee ọjị ahụ butere onye chere ya ihu ọma. N’ihi nke a, onye chere ọjị ahụ aghaghị iji ego ma ọ bụ ihe ọ bụla aka ya ruru gosipụta obi ụtọ ya ma ọ bụrụ na o nweghị ike igbu ọkịkọ. Ma mgbe ọ bụla ọjị gbara ibe asaa n’Oko, ọ bụ iwu na onye chere ọjị ahụ ga-eji ọkịkọ mee emume iji gosi obi ụtọ ya. Ọ bụ emume ọjị gbara ibe asaa bụkarị nnukwu emume a na-emere ọjị n’Oko. Emume a na-emere ọjị gbara ibe asaa sitere na nkwenye ha na ọjị gbara ibe asaa bụ ọjị mmụọ. N’ihi nke a, o kwesịrị ka onye ọjị ahụ bịakwutere jiri ọkịkọ mee emume ya. Ọ bụ n’ihi nke a mere na mgbe ọ bụla a wara ọjị gbara ibe asaa n’Oko, a na-eji eriri ekekọ ya ma ọ bụrụ na onye chere ya enweghị ike ịzụ ọkịkọ a ga-eji mee emume ya. N’ọnọdụ dị otu a, a ga-eweta ọjị ọzọ waa nke ndị nọ ebe ahụ ga-ata. Ma n’ụbọchị onye chere ọjị ahụ zụtara ọkịkọ maka emume a na-emere ọjị gbara ibe asaa, ka a ga-awa ọjị ahụ ma mee emume ya.

Downloads

Published

2026-09-19