Iwulite Amụmamụ Asụsụ Igbo site n’Usoro Ozi Ozuru Ụwa na Senchuri nke Iri Abụọ na Otu
Abstract
Ederede a nyochara usoro ozuru ụwa dị ka ọ metụtara ọmụmụ asụsụ Igbo na Naịjiria. A malitere site n’ịkọwa ihe Ozuru Ụwa pụtara na mkpụrụokwu ndị ọzọ metụtara ya. E lebara anya n’uru usoro ozuru ụwa nwere ike ịba n’amụmamụ asụsụ Igbo. A chọpụtara na e nwere ihe mkpọbi ụkwụ nye uru ndị a wee gbalịa gosipụta ụzọ dị iche iche e nwere ike isi gbanahụ ihe mkpọbi ụkwụ ndị ahụ. Aro ndị ahụ bụ site n’ịgba mbọ hụ na e nwere ezi ọchịchị n’obodo, ime ụlọ ego ka ọ kwụrụ chịm, ime ka ụlọ mmebe iwu kwụụrụ onwe ya, inwe ezi ụlọ akwụkwọ dị iche iche na ịbagide ọrụ mmepe a na-ahụ anya n’obodo. Mbunuche ederede a bụ iji uru ndị a na-erite n’usoro ozuru ụwa na ICT kwalite ọmụmụ asụsụ Igbo ka ọ ghara ịnwụ. Nsogbu nchọcha a chọrọ igbo bụ ime ka asụsụ Igbo na-ada ada ka ọ nwụnyụọ anya kwụrụkwa chịm maka azụm ahịa, ekpem ikpe, agụm akwụkwọ, wdg, dị ka asụsụ ndị e nwere na mba ụwa ndị ọzọ. Atụtụ e ji nyochaa ederede a bụ nke Nkụzi na Mmụta Lawrence (2011) bụ nke kwuru na e nwere ike iji ngwa ọrụ ọ bụla dị ire mee ka ọmụmụ asụsụ gaa n’ihu. Ederede a ga-abara ndị Igbo niile uru n’ihi na ọ bụrụ na e site na ya gbochie asụsụ Igbo ịda, ọ bụ ndị Igbo niile ga-erite uru na ya n’ihi na asụsụ bụ njirimara ndị na akara nhụbabma. Ndị ọzọ ọ ga-abara uru bụ ndị mgbasa ozi, ndị nkụzi Igbo, ụmụ akwụkwọ Igbo, wdg. Ebe e nwere otu abụọ gbasara odide asụsụ Igbo – otu ndekọ na otu ndesa, odee họọrọ idesa mkpụrụokwu edesa. Mana ndị niile e dekọrọ ọnụ na Ọkasụsụ nke SPILC kadị etu ha dị n’akwụkwọ Ọkasụsụ n’ederede a.