Asụsụ na Omenala Igbo: Ụdọ Jikọtara Igbo Niile
Abstract
Asụsụ bụ ndụ mmadụ. Ọ sọ n'otu njirimara ndị mmadụ. Mgbe mmadụ pụtara ụwa mụta asụsụ, ọ bụ mgbe ndụ onye ahụ malitere. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ na-amalite enwe mmekọrịta nke mmadụ na ibe ya; na-ekwupụta echiche ya na ebumnobi ya. Ọ bụ asụsụ ka o ji ezipụta ọnọdụ ya mgbe ọ bụla. Asụsụ dị ka mmiri nke na-atụju akpịrị mgbe akpịrị kpọrọ nkụ. Mmadụ ma ọ bụ agbụrụ ọ bụla tụfuru asụsụ atụfuela njirimara ya/ha. Asụsụ na omenala ndị bụ ihe kacha apụta ihe na njirimara ndị ahụ. N'ihi nke a, ebumnobi ederede a bụ inyocha na igosipụta mbọ a gbarala iji wee hụ na asụsụ na omenala Igbo kwụ chịm ma na-aga n'ihu taa. E kewara ederede a ụzọ atọ. Otu ụzọ kọwara ihe bụ asụsụ na omenala; njirimara ha na uru ha. Otu nke ọzọ kọwara ụzọ dị iche iche asụsụ Igbo si enwe ihe mkpọbi ụkwụ. Ụzọ nke atọ kọwara mbọ dị iche iche a na-agba iji hụ na ụdọ a jikọrọ agbụrụ Igbo niile ọnụ bụ asụsụ na omenala adobighị. Nchọcha nkọwa a ga-agbaso atụmatụ keọdịdị iji chọpụta ọnọdụ asụsụ na omenala Igbo nọ n'ụbọchị taa iji hụ ma o nwere ebe o si eri mperi ma nyekwa ụsa gbasara ụzọ dị iche iche a ga-agbaso iji belata nsogbu ndị ahụ. A chọpụtara na otu n'ime nsogbu kachasị pụta ihe bụ ajọ akparamagwa ndị Igbo bụ ndị nwe asụsụ a na-akpaso asụsụ Igbo. Ọzọ, a chọpụtara na ọtụtụ akwụkwọ ọgụgụ na odide Igbo adabachaghị n'ihe a tụrụ anya ya gbasara asụsụ Igbo.Downloads
Published
2026-10-06
Issue
Section
Articles