Aha Onye Na-Achọje Ya: Nzipụta Ya N’ejije Iko Onye Ji Ama
Keywords:
Ejije, Nkwenye Ndị Igbo, Aha, Atụtụ Agwa, AkparamaagwaAbstract
Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị na aha e nyere onye, na-edozi maọbụ emebi onye ahụ. Ndị Igbo nwere nkwenye ha nwere banyere ihe dị iche iche. Ha bụ ndị na-agba mbọ enwe echiche ha gbasara ihe ha kwenyere na ya. Nke a mere ha ji akpachapụrụ ihe ọ bụla ha na-eme anya, nke ịba aha so n’otu n’ime ha. Ha anaghị anọkata baa mmadụ aha n’amaghị mpụtara ya n’ihi na ha kwenyere na aha e nyere onye, ga-enweriri etu o si eso maọbụ achọje onye ahụ. A maara na ejije na-esi n’emereeme dị n’ime ya agbaziri mmadụ akparamaagwa ya. Ebumnobi nchọcha a bụ igosi ka odee ejije si kwenye na nkwenye a site na mbọ ọ gbara n’iji aha o nyere agwa dị n’ejije ya, egosi etu nkwenye ndị Igbo a siri metụta aha e nyere mmadụ n’ụwa a nọ n’ime ya. Nchọcha a, bụ usoro nkọwa ka ọ gbasoro n’ihi na e ji ejije Iko Onye Ji Ama nye nkọwa doro anya banyere isiokwu nchọcha a. Atụtụ agwa (behavioural theory) bụ atụtụ e ji mee nchọcha a n’ihi na ọ bụ akparamaagwa nke agwa ndị dị n’ejije a họọrọ, kpara mere nkwenye a jiri dị ire. Ọzọ bụ na ọ bụ ya ka elebara anya iji gosi etu aha e nyere ha siri zipụta akparamaagwa ha n’ụzọ dị mma maọbụ n’ụzọ dị njọ. A chọpụtara na ndị Igbo kwenyesịrị ike na aha onye na-achọje ya. Ọzọ bụ na odee ejije a họọrọ kwenyere na nke a were nye agwa dị n’ejije ya aha dabara na nkwenye a site n’ihe ha mere n’ime ejije a. A tụrụ anya na nchọcha a ga-abara ndị nne na nna uru ka ha mara na aha ha nyere ụmụ ha nwere otu ụzọ maọbụ ụzọ olenaole o si achọje ha, na ka ha ghara ịta onye ọ bụla ụta mgbe mpụtara aha ha nyere ha ga na-apụta ihe. Ọ ga-eme ka nne na nna kpachara anya ha, chọọ aha ga-edu ụmụ n’ụzọ dị mma n’ihi na agwa bụ mma mmadụ.