Agụmagụ ọnụ Igbo: Ụzọ Ịkụnye Ezi Agwa Na Ịzụlite Ụmụaka N’okpuru Ọchịchị Anaọcha Na Steeti Anambara
Keywords:
Igbo, Agụmagụ ọnụ IgboAbstract
Agụmagụ ọnụ Igbo dika anyị maara bụ ọrụ nka ndị ahụ a na-agụpụta n’ọnụ nke e deghị ede n’akwụkwọ, nke na-esi n’aka nna erute nnwa ya aka. Ọ bụ agụmagụ ndị ahụ jupụtara na nkụzi na amamihe, nke nna na-ahafe n’aka ụmụ ya site n’okwu ọnụ. N’ụwa taa, a na-ahụta n’ala adịghị mma nke mere na ọgbaghara jupụtara n'ebe niile n'obodo anyị taa nakwa n’ụwa niile. Ụzọ ndị ntoroọbịa sizi etinye aka n'agwa ọjọọ dị iche iche bịazịrị bụrụ ihe gbagwojuru anya. Ọ bụ nsogbu ndị a na ndị ọzọ kpalitere nwanchọcha n’ime nchọcha n’isiokwu a iji belata nsogbu ndị a. Ebumnobi nchọch a bụ ịchọpụta nakwa igosipụta ụzọ e nwere ike isi n’agụmagụ ọnụ Igbo kụnye ezi agwa n’ọzụzụ na ntolite ụmụaka n’Anaọcha dị na steeti Anambra. E lebara anya n’ọtụtụ akwụkwọ iji mata echiche mmadụ ụfọdụ n'isiokwu a. Atụtụ e nyochara maka nchọcha a bụ atụtụ maka akparamagwa nke John B. Watson (1878-1958). Ọ kọwara na akparamagwa ọbụla mmadụ nwere bụ nke a mụtara site na mmekọrịta na mkpakọrịta n’okirikiri ebe onye ahụ nọ, ebe ọnatarachi maọbụ eburu pụta ụwa enwechaghị oke ihe nketa n’ebe akparamagwa nwata dị dịka ọ dị na mmekọrịta. Ndị e jiri mee nchọcha a dị mmadụ iri ise, ndị gụnyere ụmụnwoke na ụmụ nwaanyị ndị nọ n'agbata afọ iri isii ruo afọ iri itoolu. E setere ndị a site n’obodo niile mejupụtara Anaọcha. Ha bụ: Akwaeze, Obeledu Neni, Agụlụzigbo, Ichida, Adazị anị, Adazị enu, Adazị nnukwu, Agụlụ na Agụkwu nri. Nchọcha a bụ nke gbasoro usoro sọvee nke ngwaọrụ e ji nweta data ya bụ ajụjụ ọnụ a gbara ndị e ji mee nchọcha na akarangwa foonu. A kpachapụrụ anya tụchaa ihe a chịkọbara. A chọpụtara na agụmagụ ọnụ n'oge ochie rụụrụ ndị nna nna anyị ha nnukwu ọrụ n'ịtọrọ ụmụaka ezi ntọala na ụkpụrụ ha sooro were baara onwe ha, ndị mụrụ ha na obodo ha uru. Nke a mere n’ihi na agụmagụ ọnụ Igbo niile bara ụba na nkụzị na amamihe nyere ụdị akparamagwa ọbụla nwata nwere ike ịkpa. E mejupụtara nke a n’ihi na e hiwere ha site n'omenaala na ọdịnaala ndị Igbo. Nwanchọcha mechiri site n'ịtụnye arọ; ka ndị nne na nna tinyere ndị niile nọ n'ọkwa ịzụlite ụmụaka laghachịkwa azụ n'agụmagụ ọnụ igbo n'ihi na o zuru oke n'ihe niile a chọrọ iji zụlite ụmụaka iji nwe udo na ọganiihu n'obodo.