Ntụlekọrịta Nkọmịrịkọ N’akụ Fechaa Na Nwata Rie Awọ Dị Ka O Siri Metụta Ọgbọ Globalaịzeshọn A
Keywords:
Ntụlekọrịta Nkọmịrịkọ, Edemede, IgboAbstract
Edemede a lebara anya n’ịtụlekọrịta akwụkwọ ejije abụọ ndịa: Akụ Fechaa nke Anelechi B. Chukwuezi dere na Nwata Rie Awọ nke Goddy O. Onyekaọnwụ dere. Ejije bụ njije a na-ejije mmadụ maọbụ ihe ekere ụwa site n’agwa maọbụ ọdịdị ihe ndị ahụ site na ka e siri kee ha. Akụ Fechaa bụ ejije na-ekwu na anaghị agbagha mmụọ okwu, ebe Nwata Rie Awọ na-ekwu maka Awọrọ, dimgba chụpụrụ nwunye ya, lụrụ ada ya nwaanyị n’amaghị ama. Nwanchọcha ga esite n’usoro atụtụ nnyocha agụmagụ nkọmịrịkọ wee tụchaa ejije ederede a họọrọ. Nkọmịrịkọ bụ akụkọ ọdịnaala ndị Igbo nwere, ndị ahụ na-ezipụta ihe omimi dị iche iche dịka okike, nkwenye, omenaala, ọnwụ, chi, ndụ ndị odogwu, dgz. Ndị odee ụfọdụ n’oge ugbua na-ala azụ n’ime ka akụkọ ọdịnaala Igbo na-apụtawanye ihe. Ọ bụ ụfọdụ ndị odee oge gboo bụ ndị gbara mbọ ịhụ na akụkọ ọdịnaala ndị a pụtawagara ihe site n’izipụta ha n’ọrụ ekereuche ha. Mana n’oge ugbu a, a chọpụtara na ụfọdụ akụkọ ọdịnala ndị Igbo na-adaghachizi azụ ma na-anwụkwa anwụ n’ihi akparamagwa ọjọọ ndị Igbo na-akpaso asụsụ, agụmagụ na omenala Igbo. Ọzọ bụ na ụfọdụ ndị Igbo na-agbaziri igosipụta omenaala Igbo ọsọ. Ihe ndịa niile na-eweta ndaghachi azụ n’ebe nkwenye na ọdịnaala nọ. A gaghị eleghara anya n’igosipụta ka nkọmịrịkọ siri metụta ọgbọ globalaịzeshọn a na ihe nleghara anya niile ọgbọ globalaịzeshọn a buteere ọmụmụ ihe gbasara ejije ederede Igbo dịka o siri metụta nzipụta nkọmịrịkọ. Ọ bụ ihe ndị a niile bụ nsogbu kpaliri mmụọ nwanchọcha ime nchọcha a. Ya mere, edemede a na-enyocha nkọmịrịkọ Igbo e zipụtara n’Akụ Fechaa na Nwata Rie Awọ. E nyochakwara ụfọdụ ederede nchọpụtaga dabara n’isiokwu a. Nkọmịrịkọ e zipụtara n’Akụ Fechaa bụ nke gosipụtara akpamike chi, ebe Nwata Rie Awọ zipụtara nkọmịrịkọ Arụ na mmerụ ala nke gosipụtara onwe ya na ndụ Awọrọ. Nkọmịrịkọ e zipụtara n’ejije abụọ a na-arụtụ aka na nkwenye ndị Igbo. A gbasoro atụtụ nnyocha agụmagụ nkọmịrịkọ n’ịtụcha ejije ederede a họọrọ ma nyochakwaa ụfọdụ ederede nchọpụtaga dabara adaba n’isiokwu a. A tụrụ anya na ederede a ga-enye aka mee ka ihe gbasara nkọmịrịkọ n’ejije ederede Igbo dowaga ndị ọgụụ na ndị niile nwere mmasị n’ebe ejije Igbo dị anya. Udị nchọcha e mere bụ ntụlekọrịta, I ji chọpụtachaa mgbanwe dị n’etu ọ dị n’oge ugbu a. A chọpụtara na nkọmịrịkọ na-enye aka iwepụta ọdịnaala n’ejije ederede Igbo. Nchọcha a ga-enyere ma ndị nkuzi ma ụmụakwụkwọ aka. Ọ bụkwa aro nwanchọcha na ndị Ọkammụta na ndị nchọcha ịga n’ihu imewaga nchọcha n’ihe gbasara ejije Igbo.