Ntụlekọrịta Obinime n’Asụsụ Igbo na Chaịniiz
Abstract
Obinime bụ nkebiokwu keaha nke na-enweta nrịgaka ya site na nkebiokwu keaha ọzọ dị na nkebiahịrị ahụ dị na ya. Nchọcha a dabeere n’atụtụ ntụlekọrịta nke Lado (1957) na atụtụ nkekọ nke Chomsky (1981), wee tụlekọrịta mmekọrịta obinime na obinonwe n’asụsụ Igbo na Chaịniiz iji gosi ebe ha yitere na ebe ha dị iche. Nchọpụta sitere na nchọcha a na-egosi na Igbo nwere naanị otu ngosipụta obinime, ya bụ mmeronwe, ebe Chaịniiz nwere ụdị abụọ, mmeronwe na mmerịta. A bịa n’iwu nkekọ, asụsụ abụọ a na-emebi iwu nkekọ isi ebe ụfọdụ. Mmereonwe nkịtị Chaịniiz, zìjǐ, na-anabata nkekọ oteaka, nke megidere iwu nkekọ. Nchọcha a dị nnukwu mkpa ebe o gosiri ebe myiri na ndịiche asụsụ Igbo na Chaịniiz iji nyere ndị Igbo na-amụ ya na ndị nkuzi ha aka ịmata ebe a ga-enwe nhagide echiche.