OSISI ỤFỌDỤ NDỊ E NWERE N’ALA IGBO NA MPỤTARA AHA HA
Keywords:
Igbo, Ndi Igbo, osisiAbstract
Nchọcha a bụ maka osisi ụfọdụ dị n’ala Igbo na nkọwa aha ha. Aha bụ ihe e ji amata ma ọ bụ kpọpụta ihe kpọmkwem, nke mere na ihe ọ bụla nwere aha nke ya. Osisi bụkwa otu n’ime ihe Chineke kere ma nye mmadụ iji kwado ndụ, mee ka ndụ dị mma, ma gboo mkpa dị iche iche. Ụfọdụ osisi ndị dị n’ala Igbo nwere nkọwa pụrụ iche sitere n’aha ndị a na-akpọ ha. Ihe kpalitere mmụọ ọrụ nchọcha a bụ ime ka ndị mmadụ mata na ụfọdụ osisi ndị dị n’ala Igbo nwere nkọwa sitere n’aha ha, nakwa na aha ụfọdụ n’ime osisi ndị a na-egosipụta akparamagwa, ọdịdị na ọnọdụ ha, ya bụ, otú ha si adị n’ọnụ ma ọ bụ n’anya mmadụ. Ruo ugbu a, o nwebeghị nchọcha zuru oke e mere n’asụsụ Igbo gbasara isiokwu a n’ụzọ a ga-esi chọpụta nkọwa aha osisi ndị a. N’ihi nke a, nwanchọcha gbasoro Usoro Nkọwa n’ime nchọcha a. Ebumnuche bụ isi nke nchọcha a bụ ịchọpụta ma kọwaa ụfọdụ aha osisi ndị dị n’ala Igbo na nkọwa ha. Nchọpụta gosiri na ụfọdụ osisi ndị a na-akpa agwa ma ọ bụ nwee ọdịdị kwekọrọ n’ịhụnanya ma ọ bụ nkọwa dị n’aha ha. Atụmatụ echiche ndị kwadoro nchọcha a bụ Atụmatụ Njirimara na Atụmatụ Ntụgharị Aka. Nchọcha chọpụtara na ụfọdụ n’ime osisi ndị a bụ osisi ndị dị n’ebe ndị mmadụ bi na gburugburu ha, mana ọtụtụ mmadụ amaghị nkọwa aha ha. Ụfọdụ n’ime ha bụkwa osisi ndị a na-ahụkarị n’ime oke ọhịa. Dịka ọmụmaatụ, Anụnụebe, nke nkọwa aha ya bụ “nnụnụ ebe ebe,” na Osigburummụọ, nke aha ya na-egosi na osisi ahụ na-esi ajọ isi nke na-adịghị mma ịnọ ya nso, tinyere ndị ọzọ. A chọpụtakwara na ụfọdụ n’ime osisi ndị a nwere nnukwu ugwu na nsọpụrụ pụrụ iche n’ala Igbo karịa ibe ha, n’ihi uru, nkwenkwe, ma ọ bụ ọnọdụ ha n’omenala ndị Igbo. Nwanchọcha nwetara ngwa nchọcha site n’akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche na ajụjụ ọnụ ya na ndị maara ihe ekwe na-akụ n’ihe gbasara osisi ndị dị n’ala Igbo. Nchọcha a na-atụ aro ka ndị mmadụ jiri ihe ọmụma na ahụmịhe ha na-eme nchọpụta mgbe ọ bụla, site n’itinye uche na ichebara ihe ndị ha na-ahụ gburugburu ha echiche nke ọma. N’ikpeazụ, nchọcha a na-atụ aro ka ndị nchọcha ndị ọzọ gaa n’ihu n’ime nchọcha gbasara isiokwu ndị yiri nke a, dịka akụkụ ahụ mmadụ na nkọwa aha ha, ma ọ bụ nkọwa aha anụmanụ dị iche iche e nwere n’ala Igbo. N’ụzọ dị otu a, a ga-eme ka ọmụmụ gbasara asụsụ, omenala na echiche ndị Igbo baa ụba.