AGWARA NJIKỌ AKỤKỤ AHỤ NA NGWAA N’IGBO
Keywords:
Igbo, Ndi Igbo, Agwara Njikọ Akụkụ Ahụ Mmadụ na Ngwaa n’IgboAbstract
Akụkụ ahụ mmadụ bụ ihe ndị na-egosi onwe ha n’elu ahụ mmadụ nakwa n’ime ahụ mmadụ, dabere n’otú chi onye ahụ siri kee ya. Akụkụ ahụ mmadụ dị nnukwu mkpa na ndụ mmadụ, n’ihi na ọ bụ mpaghara dị iche iche dị n’ahụ mmadụ nke e ji arụ ọrụ, emepụta ihe, ma ọ bụ gboo mkpa dị iche iche. Akụkụ ahụ mmadụ na ngwaa na-enwe mmekọrịta pụrụ iche n’asụsụ Igbo. Ngwaa n’onwe ya bụ nkejiasụsụ na-ezipụta mmegharị, omume, ma ọ bụ ọnọdụ dịịrị ihe a na-ekwu maka ya n’ahịrịokwu. Ọ bụkwa ngwaa na-egosi omume ma ọ bụ ọnọdụ ihe a na-ekwu maka ya n’ahịrịokwu. Ebumnuche nchọcha a bụ ịchọpụta akụkụ ahụ mmadụ dị iche iche na ngwaa ha họọrọ, iji mata ihe jikọrọ ha na ihe kpatara ha ji agakọrịta n’asụsụ Igbo. Nchọcha a na-achọkwa ịmata ọrụ akụkụ ahụ mmadụ dị iche iche na ihe ndị a na-eji akụkụ ahụ mmadụ eme. Ebumnuche abụọ ndị a kpalitere mmụọ nwa nchọcha ịbagide nchọcha a nke isiokwu ya bụ “Agwara Njikọ Akụkụ Ahụ Mmadụ na Ngwaa n’Igbo.” Usoro nchọcha a gbasoro bụ Usoro Nkowa. Atụmatụ echiche nke na-enye ntọala maka nchọcha a bụ Atụmatụ Mkpurụ Echiche Ndịnokwu (Theory of Componential Analysis). Nchọpụta nchọcha a gosiri na akụkụ ahụ ọ bụla nwere mkpurụ echiche ndị kwesịrị ịdịịrị ya tupu a kọwaa ma ọ bụ kọwapụta ya nke ọma. Nchọpụta ọzọ gosikwara na ọ bụ mkpurụ echiche ndị a mejupụtara echiche zuru oke nke akụkụ ahụ mmadụ ọ bụla. Otu aka ahụ ka o si metụta akụkụ ngwaa. A chọpụtakwara na tupu ngwaa na akụkụ ahụ mmadụ agakọrịta nke ọma, ha ga-enwerịrị ụfọdụ mkpurụ echiche ndị kwekọrọ. N’ihi ya, akụkụ ahụ mmadụ na ngwaa na-agakọrịta mgbe ha nwere agwara ọnụ, ya bụ, mgbe njirimara echiche ha kwekọrọ nke ọma n’ihe a chọrọ igosipụta n’ahịrịokwu. Nke a na-egosi na mmekọrịta dị n’etiti akụkụ ahụ mmadụ na ngwaa abụghị naanị mmekọrịta nkịtị, kama ọ bụ mmekọrịta sitere n’usoro echiche na njirimara nke okwu ndị ahụ. Nchọcha a ga-abara ndị odee, ụmụ akwụkwọ, ndị ọkà mmụta asụsụ na ndị nkụzi na-akụzi asụsụ Igbo nnukwu uru. Ọ ga-enyekwa aka n’ịkwalite ọmụmụ banyere ụtọasụsụ, okwu na nhazi echiche n’asụsụ Igbo. N’otu aka ahụ, nchọcha a ga-atụnye ụtụ n’ịkwalite na ichekwa asụsụ Igbo site n’ịmụtakwu mmekọrịta dị n’etiti akụkụ ahụ mmadụ na ngwaa n’asụsụ Igbo.